Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 29:1-8 Bible Nso (IGBOB)

1. Nka bu kwa ihe i gēme ha ido ha nsọ, ka ha we burum ndi-nchu-àjà: were otù nwa-oke-ehi na ebulu abua nke zuru okè,

2. na achicha ekoghieko, na ob͕e achicha ufọdu ekoghieko nke agwara manu, na mbadamba-achicha ufọdu ekoghi-eko nke etere manu: utu flour nke ọka wheat ka i gēwere me ha.

3. I gētiye ha n'otù nkata, bute ha nso nime nkata ahu, ha na oke-ehi ahu na ebulu abua ahu.

4. Eron na umu-ya ndikom ka i gēme kwa ka ha biarue nso ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute, i gēwere miri sa ha aru.

5. I gāchiri kwa uwe ahu, yikwasi Eron uwe-ime, na uwe-nwuda ephod, na ephod, na ihe-ib͕ochi-obi, were kwa ihe-ọkiké nke ephod nke onye-ọ̀kà kpara ke ya:

6. i gēkpukwasi kwa akwa nkechi ahu n'isi-ya, tiye okpu nsọ nke onye-nchu-àjà n'elu ákwà-nkukù-isi ahu.

7. I gēwere kwa manu otite-manu ahu wukwasi n'isi-ya, we te ya.

8. Umu-ya ndikom ka i gēme kwa ka ha biarue nso, i gēyikwasi ha uwe-ime.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 29