Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 27:7-18 Bible Nso (IGBOB)

7. Agēme ka nkpa-n'aka ahu ba na nb͕a-aka ahu, nkpa-n'aka ahu gādi kwa n'elu akuku abua nke ebe-ichu-aja, mb͕e anēbu ya.

8. I gēwere ibo me ya ka ọ di ka ib͕e: dika emeworo ka i hu ya anya n'ugwu a, otú a ka ha gēme ya.

9. I gēme kwa ogige ebe-obibi ahu: akuku Ndida nke chere iru na Ndida gēnwe ákwà-ngechi igechi ogige ahu nke ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, ọgu cubit ise n'ogologo gādiri otù akuku ahu:

10. ide-ya gādi orú, ukwu-ha kwa orú, ha gābu ọla; nkpọye nile nke ide ahu na ngegide nile ha gābu ọla-ọcha.

11. Otú a akuku Ugwu gēnwe kwa n'ogologo-ya ákwà-ngechi ọgu cubit ise n'ogologo, ide-ya gādi orú, ukwu-ha kwa orú, ha gābu ọla; nkpọye nile nke ide ahu na ngegide nile ha gābu ọla-ọcha.

12. Obo-sara ogige ahu n'akuku Ọdida-anyanwu gēnwe kwa ákwà-ngechi nke ọgu cubit abua na iri: ide-ha gādi iri, ukwu-ha iri kwa.

13. Obosara ogige ahu n'akuku Iru-anyanwu nke chere iru n'ọwuwa-anyanwu gādi ọgu cubit abua na iri.

14. Ákwà-ngechi cubit iri na ise ka otù akuku ọnu-uzọ-ama-ya gēnwe: ide-ha gādi atọ, ukwu-ha atọ kwa.

15. Akuku nke-ọzọ nke ọnu-uzọ-ama-ya gēnwe kwa ákwà-ngechi cubit iri na ise: ide-ha gādi atọ, ukwu-ha atọ kwa.

16. Ọnu-uzọ-ama nke ogige ahu gēnwe kwa ákwà-nkwuchi orú cubit, nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, bú ọlu onye-ọdudu-ákwà: ide-ha gādi anọ, ukwu-ha anọ kwa.

17. Ide nile nke ogige ahu buruburu gabu ihe egegidere ngegide n'ọla-ọcha; nkpọye-ha gābu ọla-ọcha; ma ukwu-ha gābu ọla.

18. Ogologo nke ogige ahu gābu ọgu cubit ise, obosara-ya gābu ọgu abua na iri ọgu abua na iri, idi-elu-ya gābu cubit ise; ọ gābu ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, ma ukwu-ha gābu ọla.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 27