Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 27:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. I gēme kwa ebe-ichu-àjàm ahu; ọ gābu osisi acacia, cubit ise bu ogologo-ya, cubit ise bu kwa obosara-ya; ebe-ichu-àjà ahu gēnwe akuku anọ ra nrata: cubit atọ ka idi-elu-ya gādi kwa.

2. I gēme kwa mpì-ya n'elu nkuku anọ ya: mpì-ya gēsite na ya: i gāmachita kwa ya ọla.

3. I gēme kwa ite-ya nile inara ntu-ya, na osekè-ya nile, na ọkwa-nwusa-ya nile, na ndudu-ya nile, na ihe-igu-ọku-ya nile: ọbuná ihe-ya nile ka i geji ọla me.

4. I gēme-kwa-ra ya ihe-ọkpukpa, ihe eji ub͕u ọla me; i gēme kwa nb͕a-aka ọla anọ n'elu ub͕u ọla ahu, n'elu nsọtu-ya anọ.

5. I gētiye ya n'okpuru ebe dipuru adipu buruburu ebe-ichu-àjà ahu n'okpuru, ka ub͕u ọla ahu we rue na nkera ebe-ichu-àjà ahu.

6. I gēme-kwa-ra ebe-ichu-àjà ahu nkpa-n'aka, bú nkpa-n'aka osisi acacia, machita ha ọla.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 27