25. Ha gādi kwa ibo asatọ, na ukwu ọla-ọcha ha, ukwu iri na isi; ukwu abua n'okpuru otù ibo, ukwu abua kwa n'okpuru ibo ọzọ.
26. I gēme kwa nkpọrọ osisi acacia; ise ka i gēmere ibo otù akuku nke ebe-obibi ahu,
27. nkpọrọ ise ka i gēme-kwa-ra ibo akuku nke-ọzọ nke ebe-obibi ahu, nkpọrọ ise ka i gēme-kwa-ra ibo akuku nke ebe-obibi, bú isi-ya chere iru n'Ọdida-anyanwu.
28. Nkpọrọ etiti nke di n'etiti ibo, anēme kwa ya ka o si n'otù nsọtu gabiga rue nsọtu ọzọ.
29. I gāmachita kwa ibo nile ọla-edo, were kwa ọla-edo me nb͕a-aka-ha, ka ha buru ọnọdu itiye nkpọrọ ahu: i gāmachita kwa nkpọrọ nile ọla-edo.
30. I gēwuli kwa ebe-obibi ahu elu dika ọdidi-ya ekpere n'ikpe si di nke emeworo ka i hu ya anya n'ugwu a.
31. I gēme kwa ákwà-nb͕ochi nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma: ọ gābu ọlu onye-ọ̀kà, ọ gēme ya ka o yie cheru-bim:
32. i gētiye ya n'elu ide acacia anọ amachitara ọla-edo, nkpọye-ha gābu ọla-edo, n'elu ukwu ọla-ọcha anọ.
33. I gētiye kwa ákwà-nb͕ochi ahu n'okpuru nko ahu, i gēbubata kwa n'ebe ahu nime ákwà-nb͕ochi ahu ib͕e ihe-àmà ahu: ákwà-nb͕ochi ahu gākpa-kwa-ra unu ókè n'etiti ebe nsọ ahu na ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile.
34. I gētiye kwa ebe-nkpuchi-nmehie ahu n'elu ib͕e ihe-àmà nime ebe nsọ ahu kachasi ebe nsọ nile.
35. I gādọba table ahu n'èzí ákwà-nb͕ochi ahu, na ihe-idọba-oriọna ahu na ncherita-iru table n'akuku ebe-obibi ahu chere iru na Ndida: ma table ka i gētiye n'akuku Ugwu.
36. I gēme-kwa-ra ọnu-uzọ Ulo-ikwū ahu ákwá-nkwuchi, nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma; ọ gābu ọlu onye-ọdudu-ákwà.
37. I gēme-kwa-ra ákwà-nkwuchi ahu ide acacia ise, machita ha ọla-edo; nkpọye-ha gābu ọla-edo: i gāwu-kwa-ra ha ukwu ọla ise.