Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 26:18-29 Bible Nso (IGBOB)

18. I gēme-kwa-ra ebe-obibi ahu ibo ahu, orú ibo i gēmere akuku Ndida chere iru na Ndida.

19. Ọgu ukwu ọla-ọcha abua ka i gēme kwa n'okpuru orú ibo ahu; ukwu abua n'okpuru otù ibo inara ihe-nhiọye-ya abua, ukwu abua kwa n'okpuru ibo ọzọ inara ihe-nhiọye-ya abua.

20. I gēme-kwa-ra akuku nke-abua nke ebe-obibi ahu, bú akuku Ugwu, orú ibo:

21. na ọgu ukwu ọla-ọcha ha abua; ukwu abua n'okpuru otù ibo, ukwu abua kwa n'okpuru ibo ọzọ.

22. Isi ebe-obibi ahu nke chere iru n'Ọdida-anyanwu ka i gēme-kwa-ra ibo isi.

23. Ibo abua ka i gēme-kwa-ra nkuku ebe-obibi ahu n'isi-ya.

24. Ha gābu ihe abua ejikọtara n'otù n'okpuru, ha abua gābu kwa otù ihe zuru okè rue isi-ya rue otù nb͕a-aka ahu: otú a ka ọ gādiri ha abua; nkuku abua ahu ka ha gādiri.

25. Ha gādi kwa ibo asatọ, na ukwu ọla-ọcha ha, ukwu iri na isi; ukwu abua n'okpuru otù ibo, ukwu abua kwa n'okpuru ibo ọzọ.

26. I gēme kwa nkpọrọ osisi acacia; ise ka i gēmere ibo otù akuku nke ebe-obibi ahu,

27. nkpọrọ ise ka i gēme-kwa-ra ibo akuku nke-ọzọ nke ebe-obibi ahu, nkpọrọ ise ka i gēme-kwa-ra ibo akuku nke ebe-obibi, bú isi-ya chere iru n'Ọdida-anyanwu.

28. Nkpọrọ etiti nke di n'etiti ibo, anēme kwa ya ka o si n'otù nsọtu gabiga rue nsọtu ọzọ.

29. I gāmachita kwa ibo nile ọla-edo, were kwa ọla-edo me nb͕a-aka-ha, ka ha buru ọnọdu itiye nkpọrọ ahu: i gāmachita kwa nkpọrọ nile ọla-edo.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 26