Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 25:6-17 Bible Nso (IGBOB)

6. na manu itiye n'ihe nēnye ìhè, na uda di iche iche itiye na manu nke otite-manu ahu, na ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ me;

7. na nkume onyx, na nkume di iche iche ihiọgide n'ihe, ihiọgide n'ephod na ihiọgide n'ihe-ib͕ochi-obi.

8. Ka ha me-kwa-ram ebe nsọ; ka M'we biri n'etiti ha.

9. Dika ihe nile Mu onwem nēme ka i hu, bú ihe-atù nke ebe-obibim, na ihe-atù nke ihe-ya nile, ọbuná otú a ka unu gēme ya.

10. Ha gēme kwa ib͕e osisi acacia: cubit abua na nkera ka ogologo-ya gādi, otù cubit na nkera ka obosara-ya gādi, otù cubit na nkera ka idi-elu-ya gādi.

11. I gāmachita kwa ya ọla-edo anāgwaghi agwa, nime na azu ka i gāmachita ya, i gēme kwa mpempe ọla-edo n'elu-ya buruburu.

12. I gāwu-kwa-ra ya nb͕a-aka ọla-edo anọ, tiye ha n'ukwu anọ ya; bú nb͕a-aka abua n'otù akuku-ya, na nb͕a-aka abua n'akuku-ya ọzọ.

13. I gēme kwa nkpa-n'aka osisi acacia, machita ha ọla-edo.

14. I gēme kwa ka nkpa-n'aka ahu ba na nb͕a-aka ahu n'elu akuku ib͕e ahu, iwere ha nēbu ib͕e ahu.

15. Nime nb͕a-aka nke ib͕e ahu ka nkpa-n'aka ahu ganādi: agaghi-ewepu ha nime ya.

16. I gētiye kwa n'ib͕e ahu ihe-àmà M'gēnye gi.

17. I gēme kwa ebe-nkpuchi-nmehie nke ọla-edo anāgwaghi agwa: cubit abua na nkera ka ogologo-ya gādi, otù cubit na nkera ka obosara-ya gādi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 25