Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 25:23-38 Bible Nso (IGBOB)

23. I gēme kwa table osisi acacia: cubit abua ka ogologo-ya gādi, otù cubit ka obosara-ya gādi, otù cubit na nkera ka idi-elu-ya gādi.

24. I gāmachita kwa ya ọla-edo anāgwaghi agwa, me-kwa-ra ya mpempe ọla-edo buruburu.

25. I gēme-kwa-ra ya ihe-njikọ buruburu nke ra ka otù ọbu-aka, i gēme-kwa-ra ihe-njikọ-ya mpempe ọla-edo buruburu.

26. I gēme-kwa-ra ya nb͕a-aka ọla-edo anọ, tiye nb͕a-aka ahu na nkuku ano nke di n'ukwu anọ ya.

27. Na nso ihe-njikọ ahu ka nb͕a-aka gādi, ka ha buru ọnọdu itiye nkpa-n'aka eji ebu table ahu.

28. I gēji kwa osisi acacia me nkpa-n'aka ahu, i gāmachita kwa ha ọla-edo, agēji ha ebu table.

29. I gēme kwa afere-ya nile, na ngaji-ya nile, na iko-ya nile, na ọkwa-ya nile, nke eji awusi àjà-ihe-ọṅuṅu: ọla-edo anāgwaghi agwa ka i gēwere me ha.

30. I gādọba kwa achicha nke iru Chineke n'elu table ahu n'irum mb͕e dum.

31. I gēme kwa ihe-idọba-oriọna nke ọla-edo anāgwaghi agwa: ihe akpuru akpu ka agēme ihe-idọba-oriọna ahu, bú ukwu-ala-ya, na alaka-ya; iko-ya nile, bú isi-ya nile, na okoko-ya nile, gēsite na ya:

32. alaka isi ganēsi n'akuku-ya abua waputa; alaka atọ nke ihe-idọba-oriọna ahu n'otù akuku-ya, alaka atọ nke ihe-idọba-oriọna ahu kwa n'akuku-ya nke-ọzọ:

33. iko atọ emere dika ifuru osisi almond gādi n'otù alaka, otù isi na otù okoko; iko atọ emere dika ifuru osisi almond gādi kwa n'alaka-ibe-ya, otù isi na otù okoko: otú a ka ọ gādiri alaka isi ahu nke nēsi n'ihe-idọba-oriọna ahu waputa:

34. iko anọ emere dika ifuru osisi almond gādi kwa n'ihe-idọba-oriọna ahu, isi-ha na okoko-ha:

35. otù isi gādi kwa n'okpuru alaka abua site na ya, otù isi gādi kwa n'okpuru alaka abua site na ya, otù isi gādi kwa n'okpuru alaka abua site na ya, diri alaka isi ahu nke nēsi n'ihe-idọba-oriọna waputa.

36. Isi-ha alaka-ha gēsite na ya; ihe-idọba-oriọna ahu nile gābu otù ihe eji ọla-edo nke anāgwaghi agwa kpu.

37. I gēme kwa oriọna-ya, ha gādi asa: ha gēweli kwa oriọna-ya nile, ka ọ we nye ìhè na ncherita-iru ya.

38. Nkpa-ya nile na ihe-ikpakepu-ọku-ya nile gābu ọla-edo anāgwaghi agwa.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 25