Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 25:17-32 Bible Nso (IGBOB)

17. I gēme kwa ebe-nkpuchi-nmehie nke ọla-edo anāgwaghi agwa: cubit abua na nkera ka ogologo-ya gādi, otù cubit na nkera ka obosara-ya gādi.

18. I gēme kwa cherubim ọla-edo abua; ihe akpuru akpu ka i gēme ha, na nsọtu abua nke ebe-nkpuchi-nmehie.

19. Gi me otù cherub n'otù nsọtu, na otù cherub na nsọtu nke-ọzọ: site n'ebe-nkpuchi-nmehie ka unu gēme cherubim ahu n'elu nsọtu-ya abua.

20. Cherubim ahu ganāb͕asa kwa nkù-ha n'elu, nēkpuchi ebe-nkpuchi-nmehie na nkù-ha, iru-ha nēcherita kwa onwe-ha; n'ebe ebe-nkpuchi-nmehie di ka iru cherubim ahu gādi.

21. I gātukwasi kwa ebe-nkpuchi-nmehie ahu n'ib͕e ahu, n'elu ya; nime ib͕e ahu ka i gētiye ihe-àmà nke M'gēnye gi.

22. M'gēzute kwa gi n'ebe ahu, kpayere gi uka site n'elu ebe-nkpuchi-nmehie, site n'etiti cherubim abua nke di n'elu ib͕e ihe-àmà ahu, bayere ihe nile nke M'gēnye gi n'iwu n'ebe umu Israel nọ.

23. I gēme kwa table osisi acacia: cubit abua ka ogologo-ya gādi, otù cubit ka obosara-ya gādi, otù cubit na nkera ka idi-elu-ya gādi.

24. I gāmachita kwa ya ọla-edo anāgwaghi agwa, me-kwa-ra ya mpempe ọla-edo buruburu.

25. I gēme-kwa-ra ya ihe-njikọ buruburu nke ra ka otù ọbu-aka, i gēme-kwa-ra ihe-njikọ-ya mpempe ọla-edo buruburu.

26. I gēme-kwa-ra ya nb͕a-aka ọla-edo anọ, tiye nb͕a-aka ahu na nkuku ano nke di n'ukwu anọ ya.

27. Na nso ihe-njikọ ahu ka nb͕a-aka gādi, ka ha buru ọnọdu itiye nkpa-n'aka eji ebu table ahu.

28. I gēji kwa osisi acacia me nkpa-n'aka ahu, i gāmachita kwa ha ọla-edo, agēji ha ebu table.

29. I gēme kwa afere-ya nile, na ngaji-ya nile, na iko-ya nile, na ọkwa-ya nile, nke eji awusi àjà-ihe-ọṅuṅu: ọla-edo anāgwaghi agwa ka i gēwere me ha.

30. I gādọba kwa achicha nke iru Chineke n'elu table ahu n'irum mb͕e dum.

31. I gēme kwa ihe-idọba-oriọna nke ọla-edo anāgwaghi agwa: ihe akpuru akpu ka agēme ihe-idọba-oriọna ahu, bú ukwu-ala-ya, na alaka-ya; iko-ya nile, bú isi-ya nile, na okoko-ya nile, gēsite na ya:

32. alaka isi ganēsi n'akuku-ya abua waputa; alaka atọ nke ihe-idọba-oriọna ahu n'otù akuku-ya, alaka atọ nke ihe-idọba-oriọna ahu kwa n'akuku-ya nke-ọzọ:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 25