1. Jehova we gwa Moses okwu, si,
2. Gwa umu Israel ka ha wetara m àjà-nbuli: n'aka nwoke ọ bula nke obi-ya nēme ya ka ọ nwe afọ-ofufo ka unu gānara àjà-nbulim.
3. Nka bu kwa àjà-nbuli ahu nke unu gānara n'aka ha; ọla-edo, na ọla-ọcha, na ọla;
4. na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha, na aji ewu;
5. na akpukpọ ebulu esijiri ọbara-ọbara, na akpukpọ seal, na osisi acacia;
6. na manu itiye n'ihe nēnye ìhè, na uda di iche iche itiye na manu nke otite-manu ahu, na ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ me;
7. na nkume onyx, na nkume di iche iche ihiọgide n'ihe, ihiọgide n'ephod na ihiọgide n'ihe-ib͕ochi-obi.
8. Ka ha me-kwa-ram ebe nsọ; ka M'we biri n'etiti ha.