Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 25:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova we gwa Moses okwu, si,

2. Gwa umu Israel ka ha wetara m àjà-nbuli: n'aka nwoke ọ bula nke obi-ya nēme ya ka ọ nwe afọ-ofufo ka unu gānara àjà-nbulim.

3. Nka bu kwa àjà-nbuli ahu nke unu gānara n'aka ha; ọla-edo, na ọla-ọcha, na ọla;

4. na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha, na aji ewu;

5. na akpukpọ ebulu esijiri ọbara-ọbara, na akpukpọ seal, na osisi acacia;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 25