Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 24:10-18 Bible Nso (IGBOB)

10. ha we hu Chineke nke Israel; ma n'okpuru ukwu-Ya abua ọ di ka pavement eji nkume sapphire me, ọ di kwa ka elu-igwe onwe-ya n'idi-ọcha.

11. Ma Ọ setipughi aka-Ya megide ndi ahu arọputara n'etiti umu Israel: ha we hu Chineke anya, rie ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu.

12. Jehova we si Moses, Rigokutem rue ugwu a, nọ kwa n'ebe ahu: ka M'nye kwa gi nkume abua ahu di mbadamba, na iwum, na ihe M'nyere n'iwu, bú nke M'deworo, ka i we zí ha.

13. Moses we bilie, ya na Joshua onye nējere ya ozi: Moses we rigo n'ugwu nke Chineke.

14. Ma ndi-okenye Israel ka ọ siri, Nọdunu n'ebe a nēche ayi, rue mb͕e ayi gālaghachikute unu: ma, le, Eron na Hua nọ n'etiti unu: onye nwere okwu, ya biakute ha nso.

15. Moses we rigo n'ugwu ahu, igwe-oji ahu we kpuchie ugwu.

16. Ebube Jehova biri n'elu ugwu Sainai, igwe-oji ahu nēkpuchi kwa ya ubọchi isi: O si n'etiti igwe-oji ahu kpọ Moses òkù n'ubọchi nke-asa.

17. Ma nile ebube Jehova anya, ọ di ka ọku nērichapu n'elu ugwu ahu n'anya umu Israel.

18. Moses we ba n'etiti igwe-oji ahu, rigorue ugwu ahu: Moses we nọ n'ugwu ahu ọgu ubọchi abua ehihie na abali.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 24