Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 23:21-33 Bible Nso (IGBOB)

21. Lezie anya n'iru ya, ge kwa nti n'olu-ya; enupula isi n'okpuru ya: n'ihi na ọ gaghi-ab͕aghara njehie-unu; n'ihi na aham di nime ya.

22. N'ihi na, ma ọ buru na i ge nti n'olu-ya n'ezie, we me ihe nile nke M'nēkwu, M'gābu-kwa-ra ndi-iro-gi onye-iro, kpab͕u kwa ndi nākpab͕u gi.

23. N'ihi na mọ-ozim ganēje n'iru gi, me ka i bakute ndi-Amorait, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi Kenean, na ndi-Haivait, na ndi Jebus: M'gēzopu kwa ha n'uwa.

24. Akpọla isi ala nye chi nile ha, efè-kwa-la ha, eme-kwa-la dika omume nile ha si di: kama i gākwadasi ha, tipiasi kwa ogidi nile ha.

25. Ma unu gēfè Jehova, bú Chineke-unu, Ọ gāgọzi kwa nri-gi na miri-gi; M'gēwe-zuga kwa ọria n'etiti gi.

26. Ọ gaghi-adi nwayi nēmebi ime ma-ọbu nwayi-àgà n'ala-gi: M'gēmezu ọnu-ọgugu ubọchi-gi.

27. Oké ujọm ka M'gēziga n'iru gi, chusa ha, bú ndi ahu nile i gābakute ha, M'gēnye kwa gi olu ndi-iro-gi nile.

28. M'gēziga kwa ebu n'iru gi, ha gāchupu ndi-Haivait, na ndi Kenean, na ndi Het, n'iru gi.

29. M'gaghi-achupu ha n'iru gi n'otù arọ; ka ala we ghara ighọ ihe tọb͕ọrọ n'efu, anu-ọhia ewe ba uba megide gi.

30. Nwantī nwantī ka M'gāchupu ha n'iru gi, rue mb͕e i gāmu ọmùmù, we keta ala ahu.

31. M'gētiye kwa ókè-ala-gi site n'Oké Osimiri Uhie we rue oké osimiri ndi Filistia, site kwa n'ọzara rue Osimiri Yufretis: n'ihi na M'gēwere ndi bi n'ala ahu nye n'aka-unu; i gāchupu kwa ha n'iru gi.

32. Gi na ha ab͕ala ndu, gi na chi-ha ab͕a-kwa-la ndu.

33. Ha agaghi-ebi n'ala-gi, ka ha we ghara ime ka i mehie megidem: n'ihi na ọ buru na i fè chi-ha, ọ ghaghi iburu gi ọnyà.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 23