Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 23:14-19 Bible Nso (IGBOB)

14. Ub͕ò atọ ka i gēmerem ememe n'arọ.

15. I gēdebe ememe achicha ekoghi-eko: ubọchi asa ka i gēri achicha ekoghi-eko, dika M'nyere gi iwu, na mb͕e akara àkà n'ọnwa Ebib (n'ihi na ọ bu nime ya ka i siri n'Ijipt puta); ma ọ dighi onye agāhu n'irum ka ọ b͕a aka:

16. i gēdebe kwa ememe nke owuwe-ihe-ubi, bú nke nkpuru mbu nke i lutara n'ọlu, nke i nāgha n'ubi: na ememe nke nchikọta-ihe, n'ọgwugwu arọ, mb͕e i si n'ubi chikọta ihe nile i lutara n'ọlu.

17. Ub͕ò atọ n'arọ ka agāhu ndikom-i nile n'iru Onye-nwe-unu, bú Jehova.

18. Achula ọbara nke àjàm n'elu achicha koro eko; abuba nke ememem agaghi-adigide kwa abali nile rue ututu.

19. Ihe mbu nke nkpuru mbu nile nke ala-ubi-gi ka i gēwebata n'ulo nke Jehova, bú Chineke-gi. Esila nwa-ewu nime miri-ara nke nne-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 23