Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 21:22-26 Bible Nso (IGBOB)

22. Mb͕e ndikom nālu ọgu, we tie nwayi di ime ihe, ime-ya we pua, ma ajọ ihe aputagh: aghaghi iri ya nra, dika di nwayi ahu gātukwasi ya; ọ gēnye kwa site n'aka ndi-ikpé.

23. Ma ọ buru na ajọ ihe aputa, i gēme kwa ka ndu lara ndu,

24. anya lara anya, ezé lara ezé, aka lara aka, ukwu lara ukwu,

25. ida-ọku lara ida-ọku, ob͕ub͕u-mma lara ob͕ub͕u-mma, ufiri-utari lara ufiri-utari.

26. Mb͕e onye ọ bula gēti anya orù-ya nwoke, ma-ọbu anya orù-ya nwayi, ihe, we bibie ya; o gēzipu kwa ya ka ọ nwere onwe-ya n'ihi anya-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 21