21. Jehova we si Moses, Rida, b͕ara ndim àmà, ka ha we ghara inujuru n'ebe Jehova nọ ile anya, ọtútú nime ha we da.
22. Ọzọ kwa, ndi-nchu-àjà, ndi nābiakute Jehova nso, ka ha do onwe-ha nsọ, ka Jehova we ghara itiwakuru ha.
23. Moses we si Jehova, Ndi-Gi apughi irigoru ugwu Sainai: n'ihi na Gi onwe-gi b͕ara ayi àmà, si, Kpara ugwu a ókè, do kwa ya nsọ.
24. Jehova si ya, Je, rida; i gārigota kwa, gi onwe-gi, na Eron tiyere gi: ma ka ndi-nchu-àjà na ndim ghara inujuru irigokute Jehova, ka O we ghara itiwakuru ha.
25. Moses we ridakuru ndi Israel, si ha me otú a.