mb͕e ha nwere okwu, ha abiakutem; m'nēkpe kwa ikpe n'etiti madu na ibe-ya, m'nēme kwa ka ha mara ukpuru nile nke Chineke, na iwu-Ya nile.