Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 18:1-13 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma Jetro, bú onye-nchu-àjà Midian, nna nwunye Moses, nuru ihe nile Chineke mere Moses na Israel ndi-Ya, na Jehova mere ka Israel si n'Ijipt puta.

2. Jetro, bú nna nwunye Moses, we were Zipora, bú nwunye Moses, mb͕e o zipusiri ya,

3. na umu-ya ndikom abua; nke aha otù nime ha bu Giashom; n'ihi na ọ siri, Ọbìa ka m'buworo n'ala ọzọ:

4. aha nke ibe-ya bu kwa Elieza; n'ihi na ọ siri, Chineke nke nnam bu iye-akam, Ọ we naputam na mma-agha Fero:

5. Jetro, bú nna nwunye Moses, we biakute Moses, ya na umu-ya ndikom na nwunye-ya, nime ọzara ebe ya onwe-ya maworo ulo-ikwū, n'ugwu nke Chineke.

6. Ọ si Moses, Mu onwem, nna nwunye-gi, bú Jetro, abiakutewom i, mu na nwunye-gi, na umu-ya ndikom abua tiyere ya.

7. Moses we pua izute nna nwunye-ya, we kpọ isi ala, sutu kwa ya ọnu; ha we jurita onwe-ha ma ha nọ n'udo; ha we ba n'ulo-ikwū.

8. Moses we kọrọ nna nwunye-ya akukọ ihe nile Jehova mere Fero na ndi Ijipt n'ihi Israel, ike-ọgwugwu nile nke gwuru ha n'uzọ, Jehova we naputa ha.

9. Jetro we ṅuria ọṅu bayere ezi ihe nile nke Jehova mere Israel, ndi ọ naputara n'aka ndi Ijipt.

10. Jetro we si, Onye agọziri agọzi ka Jehova bu, Onye naputaworo unu n'aka ndi Ijipt, na n'aka Fero; Onye naputaworo ndi nka n'okpuru aka ndi Ijipt.

11. Ub͕u ka m'mara na Jehova di uku kari chi nile: e, n'ihe nke ha di nganga megide ha.

12. Jetro, bú nna nwunye Moses, we were àjà-nsure-ọku na àjà di iche iche ichuru Jehova: Eron we bia, ya na ndi-okenye nile nke Israel, iso nna nwunye Moses ri nri n'iru Chineke.

13. O rue, n'echi-ya, na Moses nọduru ala ikpe ndi Israel ikpe: ndi ahu we guzo n'akuku Moses si n'ututu rue anyasi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 18