Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 16:5-13 Bible Nso (IGBOB)

5. O gēru kwa, n'ubọchi nke-isi, na ha gēdozi ihe nke ha nāchibata, ọ gēme kwa okpukpu abua nke ha nāchikọta kwa-ubọchi.

6. Moses na Eron we si umu Israel nile, n'anyasi ka unu gāmara na Jehova emewo ka unu si n'ala Ijipt puta:

7. n'ututu ka unu gāhu kwa ebube nke Jehova; ebe Ọ nānu ntamu nile unu nātamu megide Jehova: ma àyi onwe-ayi bu gini, na unu nātamu ntamu megide ayi?

8. Moses we si, Nka gābu mb͕e Jehova gēnye unu anu n'anyasi ka unu rie, mb͕e Ọ gēnye kwa unu nri n'ututu ka unu riju afọ; ebe Jehova nānu ntamu unu onwe-unu nātamu megide Ya: ma àyi onwe-ayi bu gini? ha abughi imegide ayi, bú ntamu unu nātamu, kama imegide Jehova.

9. Moses we si Eron, Si nzukọ nile nke umu Israel, Biarunu nso n'iru Jehova: n'ihi na Ọ nuwo ntamu nile unu.

10. O rue, mb͕e Eron nāgwa nzukọ nile nke umu Israel okwu, na ha chere ọzara iru, ma, le, ahuru ebube Jehova n'igwe-oji ahu.

11. Jehova we gwa Moses okwu, si,

12. Anuwom ntamu nile nke umu Israel: gwa ha okwu, si, N'etiti ehihie na anyasi ka unu gēri anu, n'ututu ka unu gēriju kwa afọ na nri; unu gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

13. O rue, n'anyasi, na nnunu quail rigotara, kpuchie ebe ọmuma-ulo-ikwū-ha: n'ututu igirigi we dikwasi n'ala buru-buru ọmuma-ulo-ikwū.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 16