Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 15:1-9 Bible Nso (IGBOB)

1. Mb͕e ahu Moses na umu Israel nābukuru Jehova abù a, ha kwue, si,Ka m'bukue Jehova abù, n'ihi na O biliwo elu nke-uku:Inyinya na onye o nēbu, Ọ tubàwo ha n'oké osimiri.

2. Ikem na abù ọmam ka Ja bu,Ọ we ghọrọm nzọputa:Onye a bu Chinekem, m'gēme kwa Ya ka Ọ di elu;Chineke nke nnam, m'gēweli kwa Ya elu.

3. Jehova bu onye-agha:Jehova bu aha-Ya.

4. Ub͕ọ-ala Fero nile na usu-ndi-agha-ya ka O tufuworo n'oké osimiri:Ndi-isi-agha-ya arọputara arọputa, ha emikpuwo emikpu n'Oké Osimiri Uhie.

5. Ob͕u-miri nēkpuchi ha:Ha aridawo na miri di omìmì dika nkume.

6. Jehova, aka-nri-Gi, nke di ebube n'ike,Jehova, aka-nri-Gi nētipia onye-iro.

7. N'idi-ọtutu nke nbili-elu-Gi ka I nākwada ndi nēbili megide Gi:I nēzipu iwe-Gi di ọku, o richapu ha dika ahihia-ọka.

8. Ewere iku-ume nke oghere-imi-Gi me ka miri tua obo,Nrurù-miri guzoro onwe-ha ọtọ dika obo;Ob͕u-miri raruru aruru n'obi oké osimiri.

9. Onye-iro siri,M'gāchu, m'gēru ha aru, m'gēkesa ihe m'kwatara:Nkpuru-obim gējuputa na ha,M'gāmipu mma-agham, akam gā-napu ha ihe nile.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 15