Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 14:19-29 Bible Nso (IGBOB)

19. Mọ-ozi nke Chineke, nke nēje n'iru ọmuma-ulo-ikwū nke Israel, we bulie ije, je n'azu ha; ogidi igwe-oji ahu we si n'iru ha bulie ije, guzo n'azu ha:

20. ọ we bata n'etiti ọmuma-ulo-ikwū Ijipt na ọmuma-ulo-ikwū Israel; igwe-oji ahu na ọchichiri ahu we di, ma ọ nēnye ìhè n'abali: otù abiarughi kwa nso ibe-ya n'abali ahu nile.

21. Moses we setipu aka-ya n'elu oké osimiri; Jehova we were ifufe Iru-anyanwu di ike me ka oké osimiri ahu je n'azu n'abali ahu nile, Ọ we me oké osimiri ahu ka ọ buru ala-akọrọ, ewe kewa miri ahu.

22. Umu Israel we ba n'etiti oké osimiri ahu n'elu ala-akọrọ ahu: miri ahu we ghọrọ ha mb͕idi n'aka-nri-ha, na n'aka-ekpe-ha.

23. Ndi Ijipt we nāchu ha, so ha ba n'etiti oké osimiri, bú inyinya Fero nile, na ub͕ọ-ala-ya, na ndi-inyinya-ya.

24. O rue, nime iche-nche ututu, na Jehova lere ọmuma-ulo-ikwū ndi Ijipt anya n'ogidi ọku na igwe-oji, chusa ọmuma-ulo-ikwū ndi Ijipt.

25. O wezuga akpuru ukwu nke ub͕ọ-ala-ha, me ka ọ di ha arọ́ ime ka ha nāga: ndi Ijipt we si, Ka ayi b͕apu n'iru Israel; n'ihi na Jehova nēburu ha agha megide ndi Ijipt.

26. Jehova we si Moses, Setipu aka-gi n'elu oké osimiri, miri ahu gālata kwa n'aru ndi Ijipt, n'aru ub͕ọ-ala-ha, na n'aru ndi-inyinya-ha.

27. Moses we setipu aka-ya n'elu oké osimiri, oké osimiri ahu we lata n'orùrù o nērù mb͕e nile mb͕e chi bọrọ; ndi Ijipt we nāb͕apu n'ọbibia-ya; Jehova we richapu ndi Ijipt n'etiti oké osimiri.

28. Miri ahu we lata, kpuchie ub͕ọ-ala nile, na ndi-inyinya, bú usu-ndi-agha nile nke Fero, ndi nēso ha n'azu ba nime oké osimiri; ọ dighi ma ọ buná otù onye fọduru nime ha.

29. Ma umu Israel jere ije n'elu ala-akọrọ n'etiti oké osimiri; miri ahu we ghọrọ ha mb͕idi n'aka-nri-ha na n'aka-ekpe-ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 14