Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 14:12-19 Bible Nso (IGBOB)

12. Ọ̀ bughi nka bu okwu nke ayi gwara gi n'Ijipt, si, Rapu ayi, ka ayi we fè ndi Ijipt? N'ihi na ọ di ayi nma ifè ndi Ijipt, kari inwu n'ọzara.

13. Moses we si ndi Israel, Unu atula egwu, guzonu onwe-unu n'ebe a, hu nzọputa Jehova, nke Ọ gēmere unu ta: n'ihi na ndi Ijipt ndi unu huworo ta, unu agaghi-ahu kwa ha ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi.

14. Jehova gēburu unu agha, ma unu onwe-unu gāb͕a nkiti.

15. Jehova we si Moses, Gini mere i nētikum? gwa umu Israel ka ha bulie ije.

16. Gi onwe-gi weli kwa nkpa-n'aka-gi elu, setipu aka-gi n'elu oké osimiri, kewa ya: umu Israel gābà kwa n'etiti oké osimiri n'ala-akọrọ.

17. Ma Mu onwem, le, M'nēme ka obi ndi Ijipt di ike, ha gēso kwa ha n'azu ba: agāsọ-purukwam n'aru Fero, na n'aru usu-ndi-agha-ya nile, n'aru ub͕ọ-ala-ya nile, na n'aru ndi-inyinya-ya.

18. Ndi Ijipt gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e agāsọpurum n'aru Fero, na n'aru ub͕ọ-ala-ya nile, na n'aru ndi-inyinya-ya.

19. Mọ-ozi nke Chineke, nke nēje n'iru ọmuma-ulo-ikwū nke Israel, we bulie ije, je n'azu ha; ogidi igwe-oji ahu we si n'iru ha bulie ije, guzo n'azu ha:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 14