Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 14:10-17 Bible Nso (IGBOB)

10. Fero we biarue nso, umu Israel we welie anya-ha, ma, le, ndi Ijipt nebuli ije n'azu ha; ha we tua egwu nke-uku: umu Israel we tikue Jehova.

11. Ha si Moses, Ọ̀ bu n'ihi na ílì adighi n'Ijipt na i chipuwo ayi inwu n'ọzara? gini bu nka i meworo ayi, n'ime ka ayi si n'Ijipt puta?

12. Ọ̀ bughi nka bu okwu nke ayi gwara gi n'Ijipt, si, Rapu ayi, ka ayi we fè ndi Ijipt? N'ihi na ọ di ayi nma ifè ndi Ijipt, kari inwu n'ọzara.

13. Moses we si ndi Israel, Unu atula egwu, guzonu onwe-unu n'ebe a, hu nzọputa Jehova, nke Ọ gēmere unu ta: n'ihi na ndi Ijipt ndi unu huworo ta, unu agaghi-ahu kwa ha ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi.

14. Jehova gēburu unu agha, ma unu onwe-unu gāb͕a nkiti.

15. Jehova we si Moses, Gini mere i nētikum? gwa umu Israel ka ha bulie ije.

16. Gi onwe-gi weli kwa nkpa-n'aka-gi elu, setipu aka-gi n'elu oké osimiri, kewa ya: umu Israel gābà kwa n'etiti oké osimiri n'ala-akọrọ.

17. Ma Mu onwem, le, M'nēme ka obi ndi Ijipt di ike, ha gēso kwa ha n'azu ba: agāsọ-purukwam n'aru Fero, na n'aru usu-ndi-agha-ya nile, n'aru ub͕ọ-ala-ya nile, na n'aru ndi-inyinya-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 14