Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 12:40-51 Bible Nso (IGBOB)

40. Ma obibi umu Israel, nke ha biri n'Ijipt, di nnù arọ na orú arọ na iri.

41. O rue, n'ọgwugwu nnù arọ na orú arọ na iri ahu, ọ bu kwa n'otù ubọchi ahu ka o ruru, na usu nile nke ndi-agha Jehova siri n'ala Ijipt pua.

42. Abali nche ka ọ buru Jehova ime ka ha si n'ala Ijipt puta: otù abali ahu bu abali nche diri Jehova nke umu Israel nile nwere rue ọb͕ọ nile ha.

43. Jehova we si Moses na Eron, Nka bu ukpuru ngabiga ahu: ọ dighi onye ala ọzọ gēri ya:

44. ma orù ọ bula nke onye ọ bula, bú nke ejiri ego b͕ata, mb͕e i bìworo ya úgwù, mb͕e ahu o gēri ya.

45. Onye-nnọdu na onye egoro ọlu agaghi-eri ya.

46. N'otù ulo ka agēri ya; i gaghi-esi n'ulo wepu ihe ọ bula n'anu-aru-ya n'èzí; ọ dighi kwa ọkpukpu unu gētiji nime ya.

47. Nzukọ nile nke Israel gēme ya.

48. Ma mb͕e ọbìa gānọ n'ala-gi dika ọbìa, mb͕e ọ gēme-kwa-ra Jehova ememe ngabiga, ka ebìe nwoke ọ bula ọ nwere úgwù, mb͕e ahu ya biarue nso ime ya; ọ gādi kwa ka onye amuru n'ala: ma ọ dighi onye ọ bula anēbighi úgwù gēri ya.

49. Otù iwu ka ha gēnwe, bú onye amuru n'ala na ọbìa nke nọ dika ọbìa n'etiti unu.

50. Umu Israel nile we me ya; dika Jehova nyere Moses na Eron iwu, otú a ka ha mere.

51. O rue, n'otù ubọchi ahu, na Jehova mere ka umu Israel si n'ala Ijipt puta n'usu nile nke ndi-agha-ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 12