Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọpupu 11:1-10 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova we si Moses, Otù ihe-otiti fọduru M'gēme ka ọ bia n'aru Fero na n'aru ndi Ijipt; emesia o gēsi n'ebe a zipu unu: mb͕e ọ nēzipuzu unu nile, ọ ghaghi ichupu unu n'ebe a.

2. Biko, kwue na nti ndim, ka ha riọ kwa, nwoke ọ bula n'aka nwoke-ibe-ya na nwayi ọ bula n'aka nwayi-ibe-ya, ihe ọla-ọcha na ihe ọla-edo.

3. Jehova we nye ndi Israel amara n'iru ndi Ijipt. Ọzọ, nwoke ahu, bú Moses, di uku ri nne n'ala Ijipt, n'anya ndi-orù Fero, na n'anya ndi ahu.

4. Moses we si, Otú a ka Jehova siri, Dika n'etiti abali Mu onwem ganāpu je n'etiti Ijipt:

5. umu nile eburu uzọ mu n'ala Ijipt gānwu kwa, site na nwa eburu uzọ muru Fero nke n-anọkwasi n'oche-eze-ya, we rue nwa o buru uzọ mu, bú nwayi nēje ozi nke nọ n'azu nkume-igwe-nri; na umu nile anumanu buru uzọ mu.

6. Oké iti-nkpu gādi kwa n'ala Ijipt nile, nke iti-nkpu dika ya akādighi, iti-nkpu dika ya agaghi-adi kwa ọzọ.

7. Ma imegide umu Israel nile nkita agaghi-araghari ire-ya, imegide madu ma-ọbu anumanu: ka unu we mara na Jehova nākpa ókè n'etiti ndi Ijipt na Israel.

8. Ndi-orù-gi ndia nile gārida-kutem, kpọ isi ala nyem, si, Pua, gi onwe-gi, na ndi nile nke nọ n'ukwu-gi: emesia m'gāpu. Ọ we si n'ebe Fero nọ pua n'iwe di ọku.

9. Jehova we si Moses, Fero agaghi-ege unu nti: ka ihe-ebubem we di ọtutu n'ala Ijipt.

10. Moses na Eron we me ihe-ebube ndia nile n'iru Fero: ma Jehova mere ka obi Fero di ike, o zipughi kwa umu Israel n'ala-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọpupu 11