Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 8:19-26 Bible Nso (IGBOB)

19. Ewerewom ndi Livai nye Eron, nye kwa umu-ya ndikom, dika ndi enyere enye, site n'etiti umu Israel, ifè òfùfè nke umu Israel n'ulo-ikwū nzute, na ikpuchiri umu Israel nmehie-ha: ka ihe-otiti we ghara idi n'etiti umu Israel, n'ibiaru-nso nke umu Israel nābiaru ebe nsọm.

20. Moses, na Eron, na nzukọ nile nke umu Israel, we me ndi Livai otú a: dika ihe nile si di nke Jehova nyere Moses n'iwu bayere ndi Livai, otú a ka umu Israel mere ha.

21. Ndi Livai we wepu nmehie n'onwe-ha, su uwe-ha; Eron we fé ha ka ha buru àjà-ofufé n'iru Jehova; Eron we kpuchiere ha nmehie-ha ime ka ha di ọcha.

22. Emesia ndi Livai we ba ifè òfùfè-ha n'ulo-ikwū nzute n'iru Eron, na n'iru umu-ya ndikom: dika Jehova nyere Moses iwu bayere ndi Livai, otú a ka ha mere ha.

23. Jehova we gwa Moses okwu, si

24. Nka bu nke ndi Livai nwere: site n'onye b͕ara orú arọ na ise we gaba n'iru ha gābà ibu agha n'òfùfè nke ulo-ikwū nzute:

25. ma site n'onye b͕ara ọgu arọ abua na iri we gaba n'iru ha gēsi n'ibu-agha nke òfùfè ahu laghachi, ha agaghi-efè ọzọ;

26. ma ha gēso umu-nne-ha je ozi n'ulo-ikwū nzute, idebe ihe-ndebe, ma ọ dighi òfùfè ha gēfè. Otú a ka i gēme ndi Livai n'ihe-ndebe-ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 8