Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 7:38-53 Bible Nso (IGBOB)

38. na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ;

39. na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku;

40. na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie;

41. na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Shelumiel nwa Zurishadai.

42. N'ubọchi nke-isi onye-isi umu Gad nwere, bú Eliasaf nwa Deuel, wetara ihe-ya nso:

43. onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;

44. na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure- ọku nēsì ísì utọ;

45. na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku;

46. na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie;

47. na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Eliasaf nwa Deuel.

48. N'ubọchi nke-asa onye-isi umu Efraim nwere, bú Elishama nwa Amihud, wetara ihe-ya nso:

49. onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;

50. na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ;

51. na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku;

52. na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie;

53. na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Elishama nwa Amihud.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 7