3. ha we weta onyinye-ha iji biaru nso n'iru Jehova, ugbala isi nwere ihe-okpukpu, na ehi iri na abua; otù ugbala diri ndi-isi abua, otù ehi di-kwa-ra otù onye: ha we weta ha nso n'iru ebe-obibi ahu.
4. Jehova we gwa Moses okwu, si,
5. Nara ha n'aka-ha, ka ha we buru ihe iji fè òfùfè nke ulo-ikwū nzute; i gēwere kwa ha nye ndi Livai, nwoke ọ bula dika òfùfè-ya si di.
6. Moses we nara ugbala nile na ehi nile, nye ha ndi Livai.
7. Ugbala abua na ehi anọ ka o nyere umu Giashon, dika òfùfè-ha si di:
8. ugbala anọ na ehi asatọ ka o nye-kwa-ra umu Merari, dika òfùfè-ha si di, n'aka Itama nwa Eron, bú onye-nchu-àjà.
9. Ma ọ nyeghi umu Kohat: n'ihi na òfùfè nke ebe nsọ dikwasi ha; n'ubu ka ha nēbu ya.
10. Ndi-isi we weta nso onyinye irara ebe-ichu-àjà nye Chineke n'ubochi etere ya manu, ndi-isi ahu we weta nso onyinye-ha iji biaru nso n'iru ebe-ichu-àjà.
11. Jehova we si Moses, Otù onye-isi otù ubọchi, otù onye-isi otù ubọchi, ka ha gēweta nso onyinye-ha iji biaru nso, bayere ira ebe-ichu-àjà nye Chineke.