21. na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku;
22. na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie;
23. na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Netanel nwa Zua.
24. N'ubọchi nke-atọ onye-isi umu Zebulun nwere, bú Eliab nwa Hilon, wetara ihe-ya nso;
25. onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;
26. na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ;
27. na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku;
28. na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie;
29. na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Eliab nwa Hilon.
30. N'ubọchi nke-anọ onye-isi umu Reuben nwere, bú Elizua nwa Shedeua, wetara ihe-ya nso:
31. onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;
32. na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ;
33. na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku;
34. na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie;
35. na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù, arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Elizua nwa Shedeua.