Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 7:1-8 Bible Nso (IGBOB)

1. O rue, n'ubọchi Moses guzosiri ebe-obibi ahu, te ya manu, do ya nsọ, na ihe-ya nile, na ebe-ichu-àjà na ihe-ya nile, mb͕e ọ tesiri ha manu, do ha nsọ;

2. na ndi-isi Israel, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha, wetara ihe nso; ndi ahu bu ndi-isi ebo nile, ndi ahu bu ndi nēguzo n'isi ndi agukọtara agukọta:

3. ha we weta onyinye-ha iji biaru nso n'iru Jehova, ugbala isi nwere ihe-okpukpu, na ehi iri na abua; otù ugbala diri ndi-isi abua, otù ehi di-kwa-ra otù onye: ha we weta ha nso n'iru ebe-obibi ahu.

4. Jehova we gwa Moses okwu, si,

5. Nara ha n'aka-ha, ka ha we buru ihe iji fè òfùfè nke ulo-ikwū nzute; i gēwere kwa ha nye ndi Livai, nwoke ọ bula dika òfùfè-ya si di.

6. Moses we nara ugbala nile na ehi nile, nye ha ndi Livai.

7. Ugbala abua na ehi anọ ka o nyere umu Giashon, dika òfùfè-ha si di:

8. ugbala anọ na ehi asatọ ka o nye-kwa-ra umu Merari, dika òfùfè-ha si di, n'aka Itama nwa Eron, bú onye-nchu-àjà.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 7