Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 4:39-49 Bible Nso (IGBOB)

39. site n'onye b͕ara orú arọ na iri we gaba n'iru we rue onye b͕ara ọgu arọ abua na iri, onye ọ bula nke nābakuru usu-ndi-agha, ifè òfùfè n'ulo-ikwū nzute,

40. ọbuná ndi-ha agukọtara agukọta, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, di nnù isi na ọgu iri-na-otù na iri.

41. Ndia bu ndi agukọtara agukọta nke ab͕uru nile nke umu Giashon, onye ọ bula nke n-efè òfùfè n'ulo-ikwū nzute, ndi Moses na Eron gukọtara n'okwu-ọnu Jehova.

42. Ndi agukọtara agukọta nke ab͕uru nile nke umu Merari, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di,

43. site n'onye b͕ara orú arọ na iri we gaba n'iru we rue onye b͕ara ọgu arọ abua na iri, onye ọ bula nke nābakuru usu-ndi-agha, ifè òfùfè n'ulo-ikwū nzute,

44. ọbuná ndi-ha agukọtara agukọta, dika ab͕uru nile ha si di, di nnù asatọ.

45. Ndia bu ndi agukọtara agukọta nke ab͕uru nile umu Merari, ndi Moses na Eron gukọtara n'okwu-ọnu Jehova n'aka Moses.

46. Ndi nile agukọtara agukọta nke ndi Livai, ndi Moses na Eron na ndi-isi Israel gukọtara, dika ab͕uru nile ha si di, na dika ulo nke ndi bu nna-ha si di,

47. site n'onye b͕ara orú arọ na iri we gaba n'iru we rue onye b͕ara ọgu arọ abua na iri, onye ọ bula nke nābà ifè òfùfè, na òfùfè nke ibu n'ulo-ikwū nzute,

48. ọbuná ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù na otù nnù na ọgu iteghete.

49. N'okwu-ọnu Jehova ka agukọtara ha n'aka Moses, nwoke ọ bula dika ibu-ya si di: bú ndi-ya agukọtara agukọta, dika Jehova nyere Moses iwu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 4