Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 35:16-32 Bible Nso (IGBOB)

16. Ma ọ buru na ọ were ihe ígwè tie ya, ọ we nwua, ob͕u-madu ka ọ bu: aghaghi ime ka ob͕u-madu ahu nwua.

17. Ọ buru kwa na o were nkume di ya n'aka, bú nke gēme ka madu nwua, tie ya, o we nwua, ob͕u-madu ka ọ bu: aghaghi ime ka ob͕u-madu ahu nwua.

18. Ma ọ buru na o were ihe osisi di ya n'aka, bú nke gēme ka madu nwua, tie ya, o we nwua, ob͕u-madu ka ọ bu: aghaghi ime ka ob͕u-madu ahu nwua.

19. Onye-ọ́bọ̀ ọbara, ya onwe-ya gēme ka ob͕u-madu ahu nwua: mb͕e o zutere ya, ya onwe-ya gēme ka ọ nwua.

20. Ọ buru kwa na ọ kwatue ya n'ikpọ-asì, ma-ọbu tua ya ihe, mb͕e o nēche anwu, o we nwua;

21. ma-ọbu asi na o were aka-ya tie ya n'iro, o we nwua; aghaghi ime ka onye nētib͕u ya nwua; ob͕u-madu ka ọ bu: onye-ọ́bọ̀, ọbara gēme ka ob͕u-madu ahu nwua, mb͕e o zutere ya.

22. Ma ọ buru na ọ bu na mberede ka ọ kwaturu ya, mb͕e ọ nādighi n'iro, ma-ọbu tua ya ihe ọ bula, mb͕e ọ nēcheghi anwu,

23. ma-ọbu asi na o were nkume ọ bula, bú nke gēme ka madu nwua, me ka ọ dakwasi ya, mb͕e ọ nāhughi ya, o we nwua, ma onye ahu abughi onye-iro-ya, ọ bughi kwa onye nāchọ ime ya ihe ọjọ:

24. nzukọm gēkpe kwa n'etiti oti-ihe ahu na onye-ọ́bọ̀ ọbara dika ikpé ndia si di:

25. nzukọm gānaputa kwa ob͕u-madu ahu n'aka onye-ọ́bọ̀ ọbara, nzukọm gēme kwa ka ọ laghachi n'obodo nb͕abà ya, ebe ọ b͕alagara: o gēbi kwa nime ya rue mb͕e ọnwu onye-isi-nchu-àjà, nke ewere manu nsọ ahu te.

26. Ma ọ buru na ob͕u-madu ahu esi n'ókè-ala obodo nb͕abà ya pua ma-ọli, bú ebe ọ b͕alagara;

27. onye-ọ́bọ̀ ọbara ewe huta ya n'azu ókè-ala abodo nb͕abà ya, onye-ọ́bọ̀ ọbara ahu we b͕ue ob͕u-madu ahu, ọ dighi ikpe ọbara mara ya:

28. n'ihi na nime obodo nb͕abà ya ka o gēbi rue mb͕e ọnwu onye-isi-nchu-àjà: ma mb͕e ọnwu onye-isi-nchu-àjà gasiri ob͕u-madu ahu gālaghachi n'ala ihe-onwunwe-ya.

29. Ihe ndia gābu-kwa-ra unu ukpuru ikpé rue ọb͕ọ nile unu n'ebe-obibi-unu nile.

30. Onye ọ bula nke nētib͕u madu, n'ọnu ndi-àmà ka agēb͕u ob͕u-madu ahu: ma nání otù onye-àmà agaghi-ab͕agide madu àmà ka ọ nwua.

31. Unu anara-kwa-la ihe-nb͕aputa n'ọnọdu ndu ob͕u-madu, nke ikpe inwu ọnwu maworo: ma aghaghi ime ka ọ nwua.

32. Unu anara-kwa-la ihe nb͕aputa n'ọnọdu onye b͕alagaworo n'obodo nb͕abà ya, ka ọ we lata ibi n'ala-ya, rue mb͕e ọnwu onye-nchu-àjà.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 35