Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 35:1-17 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova we gwa Moses okwu n'ala ihe nādighi nke Moab n'akuku Jọdan na nso Jeriko, si,

2. Nye umu Israel iwu, ka ha si n'ihe-nketa nke ihe-onwunwe-ha nye ndi Livai obodo ibi nime ha; ebe-ita-nri nke obodo ahu gēnwe buruburu ha ka unu gēnye kwa ndi Livai.

3. Obodo ahu gābu-kwa-ra ha ebe ibi nime ha; ebe-ita-nri-ha gādi-kwa-ra anu-ulo-ha, di-kwa-ra àkù-ha, di-kwa-ra anu nile ha.

4. Ebe-ita-nri nke obodo nile, nke unu gēnye ndi Livai, gādi nnù cubit abua na ọgu iri site na mb͕idi obodo we gaba n'azu-ya buruburu.

5. Unu gātu kwa n'azu obodo akuku Iru anyanwu, nnù cubit ise, na akuku Ndida, nnù cubit ise, na akuku Ọdida-anyanwu, nnù cubit ise, na akuku Ugwu cubit ise, obodo gābi kwa n'etiti. Nka gāburu ha ebe-ita-nri nke obodo-ha.

6. Obodo nile nke unu gēnye ndi Livai, ha gābu obodo isi nke nb͕abà, nke unu gēnye ka ob͕u-madu we b͕alaga n'ebe ahu: unu genye kwa ọgu obodo abua na abua tiyere ha.

7. Obodo nile nke unu gēnye ndi Livai bu ọgu obodo abua na asatọ ha na ebe-ita-nri-ha.

8. Ma obodo nile ahu nke unu gēnye site n'ihe-onwunwe nke umu Israel, n'aka ndi bara uba ka unu gānara ọtutu obodo; ma n'aka ndi di ole-na-ole ka unu gānara obodo ole-na-ole: ọ bu dika ala-nketa-ya si di, nke ha nēketa, ka onye ọ bula gēnye ndi Livai site n'obodo-ya nile.

9. Jehova we gwa Moses okwu, si,

10. Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e unu onwe-unu ganāgabiga Jọdan ba n'ala Kenean,

11. unu gārọputa-kwa-ra onwe-unu obodo ufọdu, obodo nb͕aba ka ha gāburu unu; ka ob͕u-madu onye nētib͕u madu n'ọghọm we b͕alaga n'ebe ahu.

12. Obodo nile ahu gābu-kwa-ra unu ebe-nb͕abà agēsi n'aka onye-ọ́bọ̀ b͕alaga; ka ob͕u-madu we ghara inwu, rue mb͕e ọ gēguzo n'iru nzukọm ka ekpe ya ikpe.

13. Obodo ndia nke unu gēnye, obodo isi nke nb͕abá ka ha gāburu unu.

14. Obodo atọ ka unu gēnye n'ofè Jọdan nka, obodo atọ ka unu gēnye kwa n'ala Kenean; obodo nb͕abá ka ha gābu.

15. Obodo isi ndia gāburu umu Israel, buru kwa ọbìa, buru kwa onye bi n'etiti ha, ebe-nb͕abà: ka onye ọ bula nke nētib͕u madu n'ọghọm we b͕alaga n'ebe ahu.

16. Ma ọ buru na ọ were ihe ígwè tie ya, ọ we nwua, ob͕u-madu ka ọ bu: aghaghi ime ka ob͕u-madu ahu nwua.

17. Ọ buru kwa na o were nkume di ya n'aka, bú nke gēme ka madu nwua, tie ya, o we nwua, ob͕u-madu ka ọ bu: aghaghi ime ka ob͕u-madu ahu nwua.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 35