Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 33:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Ndia bu nbuli-ije umu Israel, ndi siri n'ala Ijipt puta, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di, n'aka Moses na Eron.

2. Moses we de ọpupu nile ha n'akwukwọ dika nbuli-ije nile ha si di, n'okwu-ọnu Jehova: ndia bu kwa nbuli-ije-ha dika ọpupu nile ha si di.

3. Ha we si na Rameses bulie ije n'ọnwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-ise nke ọnwa mbu ahu; n'echi nke ngabiga ahu ka umu Israel siri n'Ijipt puta n'aka di elu n'anya ndi Ijipt nile,

4. mb͕e ndi Ijipt nēlì ndi Jehova tib͕uru n'etiti ha, bú ndi nile eburu uzọ mu: ọ bu kwa n'aru ndi bu chi-ha ka Jehova mere ihe nile O kpere n'ikpe.

5. Umu Israel we si na Rameses bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Sukot.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 33