36. na Bet-nimra, na Bet-haran: bú obodo ewusiri ike, na ogige ìgwè ewu na aturu.
37. Umu Reuben wu-kwa-ra Heshbon na Eleale, na Kiriataim;
38. na Nebo, na Beal-meon, (ma ab͕anwere aha-ha,) na Sibma: ha we were aha kpọkwasi obodo ha wuru aha.
39. Umu Makia nwa Manase we je Gilead, were ya, napu ya n'aka ndi-Amorait ndi bi nime ya.
40. Moses we were Gilead nye Makia nwa Manase; ọ we biri nime ya.
41. Jaia nwa Manase we je were ebe-obibi nile ha, we kpọ ha Havot-jaia.