Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 32:34-41 Bible Nso (IGBOB)

34. Umu Gad we wue Dibon, na Atarot, na Aroea;

35. na Atrot-shofan, na Jeza, na Jọgbeha;

36. na Bet-nimra, na Bet-haran: bú obodo ewusiri ike, na ogige ìgwè ewu na aturu.

37. Umu Reuben wu-kwa-ra Heshbon na Eleale, na Kiriataim;

38. na Nebo, na Beal-meon, (ma ab͕anwere aha-ha,) na Sibma: ha we were aha kpọkwasi obodo ha wuru aha.

39. Umu Makia nwa Manase we je Gilead, were ya, napu ya n'aka ndi-Amorait ndi bi nime ya.

40. Moses we were Gilead nye Makia nwa Manase; ọ we biri nime ya.

41. Jaia nwa Manase we je were ebe-obibi nile ha, we kpọ ha Havot-jaia.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 32