31. Umu Gad umu Reuben we za, si, Okwu nke Jehova gwaworo ndi-orù-gi, otù a ka ayi gēme
32. Ayi onwe-ayi gāgabiga na njikere n'iru Jehova ba n'ala Kenean, ọ bu kwa n'aka-ayi ka ihe-onwunwe nke ihe-nketa-ayi gādi n'ofè Jọdan.
33. Moses we nye ha, bú umu Gad, na umu Reuben, na nkera ebo Manase nwa Josef, ala-eze Saihon, bú eze ndi-Amorait, na ala-eze Og, bú eze Beshan, ala ahu, dika obodo-ya nile si di n'ókè-ala nile ha, bú obodo nile nke ala ahu buruburu.
34. Umu Gad we wue Dibon, na Atarot, na Aroea;
35. na Atrot-shofan, na Jeza, na Jọgbeha;
36. na Bet-nimra, na Bet-haran: bú obodo ewusiri ike, na ogige ìgwè ewu na aturu.
37. Umu Reuben wu-kwa-ra Heshbon na Eleale, na Kiriataim;
38. na Nebo, na Beal-meon, (ma ab͕anwere aha-ha,) na Sibma: ha we were aha kpọkwasi obodo ha wuru aha.
39. Umu Makia nwa Manase we je Gilead, were ya, napu ya n'aka ndi-Amorait ndi bi nime ya.
40. Moses we were Gilead nye Makia nwa Manase; ọ we biri nime ya.
41. Jaia nwa Manase we je were ebe-obibi nile ha, we kpọ ha Havot-jaia.