Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 32:1-18 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma umu Reuben na umu Gad nwere ọtutu anu-ulo, ha riri nne nke-uku: ha we hu ala Jeza, na ala Gilead, ma, le, ebe ahu bu ebe anu-ulo;

2. umu Gad na umu Reuben we bia, gwa Moses, gwa kwa Eleeza, bú onye-nchu-àjà, gwa kwa ndi-isi nzukọ Israel, okwu, si,

3. Atarot, na Dibon, na Jeza, na Nimra, na Heshbon, na Eleale, na Seban, na Nebo, na Beon,

4. bú ala nke Jehova tib͕uru n'iru nzukọ Israel, ala anu-ulo ka ọ bu, ma ndi-orù-gi nwere anu-ulo.

5. Ha si kwa, Ọ buru na ayi ahutawo amara n'iru gi, ka enye ndi-orù-gi ala nka ibu ihe-onwunwe; emela ka ayi gabiga Jọdan.

6. Moses we si umu Gad na umu Reuben, Umu-nne-unu, hà gābà n'agha ahu, unu onwe-unu ewe nọdu n'ebe a?

7. Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka unu nēme ka obi umu Israel ju igabiga ba n'ala ahu Jehova nyeworo ha?

8. Otú a ka nna-unu-hà mere, mb͕e m'siri n'ala Kedesh-banea ziga ha ihu ala ahu.

9. Ha we rigorue ndagwurugwu Eshkol, hu ala ahu, we me ka obi umu Israel si, É-è, si na ha agaghi-abà n'ala ahu nke Jehova nyere ha-ri.

10. Iwe Jehova we di ọku n'ubọchi ahu, Ọ we ṅua iyi, si,

11. Ndikom ahu ndi nēsi n'ala Ijipt rigoputa, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, ha agaghi-ahu ala ahu ma-ọli nke M'ṅuru Abraham, ṅu-kwa-ra Aisak, ṅu-kwa-ra Jekob, iyi inye ha; n'ihi na ha esozughm n'azu:

12. ma ọ bu nání Keleb nwa Jefune, bú onye Kenizait, na Joshua nwa Nun: n'ihi na ha esozuwo Jehova n'azu.

13. Iwe Jehova we di ọku megide Israel, O we me ka ha nāṅaghari n'ọzara ọgu arọ abua, rue mb͕e ọb͕ọ ahu nile, nke nēme ihe ọjọ n'anya Jehova, gwusiri.

14. Ma, le, unu ebiliwo n'ọnọdu nna-unu-hà, nmuba nke ndikom, bú ndi-nmehie, iwere idi-ọku ọzọ tukwasi n'idi-ọku iwe Jehova megide Israel.

15. Mb͕e unu gēsi n'iso Ya n'azu laghachi, Ọ gārapu kwa ha n'ọzara nka; unu gēbibi kwa ndi nka nile.

16. Ha we biakute ya nso, si, Ogige ìgwé ewu na aturu ka ayi gēwuru anu-ulo-ayi n'ebe a, wu-kwa-ra umu-ntakiri-ayi obodo:

17. ma ayi onwe-ayi gējikere onwe-ayi je ọsọsọ n'iru umu Israel, rue mb͕e ayi gēme ka ha ba n'ebe-ha: ma umu-ntakiri-ayi gēbi n'obodo ndia ewusiri ike n'ihi ndi bi n'ala ahu.

18. Ayi agaghi-alata n'ulo-ayi, rue mb͕e umu Israel ketaworo, nwoke ọ bula ihe-nketa-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 32