Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 3:5-15 Bible Nso (IGBOB)

5. Jehova we gwa Moses okwu, si,

6. Me ka ebo Livai biaru nso, guzo kwa ha n'iru Eron, bú onye-nchu-àjà, ka ha we jere ya ozi.

7. Ha gēdebe kwa ihe-ndebe-ya na ihe-ndebe nke nzukọ Israel nile n'iru ulo-ikwū nzute, ifè òfùfè nke ebe-obibim.

8. Ha gēdebe kwa ihe nile nke ulo-ikwū nzute, na ihe-ndebe nke umu Israel, ifè òfùfè nke ebe-obibim.

9. I gēwere kwa ndi Livai nye Eron, nye kwa umu-ya ndikom: ndi enyesiworo aha ha nile site n'etiti umu Israel ka ha bu.

10. I gēwere kwa Eron na umu-ya ndikom ka ha buru ndi-nlekọta, ha gēdebe kwa ọlu-nchu-àjà-ha: ma onye ala ọzọ nke nābiaru nso, agēme ka ọ nwua.

11. Jehova we gwa Moses okwu, si,

12. Ma Mu onwem, le, esiwom n'etiti umu Israel were ndi Livai n'ọnọdu nwa ọ bula eburu uzọ mu nke nēmeghe àkpà nwa n'etiti umu Israel; ndi Livai gābu kwa ihe M'nwere:

13. n'ihi na Mu nwe nwa ọ bula eburu uzọ mu; n'ubọchi M'tib͕uru umu nile eburu uzọ mu n'ala Ijipt ka M'doro umu nile eburu uzọ mu n'Israel nsọ nye onwem, ma madu ma anumanu: nkem ka ha bu; Mu onwem bu Jehova.

14. Jehova we gwa Moses okwu n'ọzara Sainai, si,

15. Gukọta umu Livai, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, dika ab͕uru nile ha si di; nwoke ọ bula site n'onye ruru otù ọnwa we gaba n'iru ka i gāgukọta ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 3