Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 3:46-51 Bible Nso (IGBOB)

46. Ma ndi anāb͕aputa, bú ọgu madu iri-na-atọ na madu iri na atọ ahu sitere na ndi eburu uzọ mu nke umu Israel, ndi eji ka ndi Livai n'ọnu-ọgugu,

47. n'aka-ha ka i gānara shekel ise shekel ise n'isi n'isi; dika shekel nke ebe nsọ ahu si di ka i gēwere ha (shekel bu orú gerah):

48. i gēnye kwa Eron, nye kwa umu-ya ndikom, ego ahu ewere b͕aputa ndi ahu eji ka ndi Livai n'ọnu-ọgugu

49. Moses we nara ego nb͕aputa ahu n'aka ndi fọduru n'ọnu-ọgugu ndi ahu ndi Livai b͕aputara:

50. n'aka umu eburu uzọ mu nke umu Israel ka ọ nara ego ahu; nnù shekel atọ na ọgu asatọ na ise, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di;

51. Moses we nye Eron, nye kwa umu-ya ndikom, ego ndi ab͕aputara, n'okwu-ọnu Jehova, dika Jehova nyere Moses iwu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 3