Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 3:21-31 Bible Nso (IGBOB)

21. Nke Giashon bu ab͕uru ndi Libni, na ab͕uru ndi Shimai: ndia bu ab͕uru ndi Giashon.

22. Ndi-ha agukọtara agukọta, n'ọnu-ọgugu ndikom nile, site n'onye ruru otù ọnwa we gaba n'iru, ndi-ha águkotara agukọta di nnù iri-na-asatọ na ọgu iri-na-ise.

23. Ab͕uru abua nke ndi Giashon nāma ulo-ikwū-ha n'azu ebe-obibi ahu chere iru n'Ọdida-anyanwu.

24. Onye-isi ulo nna ndi Giashon nwere bu Eliasaf nwa Lael.

25. Ihe-ndebe nke umu-ndikom Giashon n'ulo-ikwū nzute bu ebe-obibi na Ulo-ikwū, na ihe-nkpuchi-ya, na ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute,

26. na ákwà-ngechi nile nke ogige ahu, na ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ ogige, nke di n'akuku ebe-obibi, na n'akuku ebe-ichu-àjà buruburu, na udọ̀-ya nile bayere òfùfè-ya nile.

27. Nke Kohat bu ab͕uru ndi Amram, na ab͕uru ndi Izha, na Ab͕uru ndi Hebron, na aburu ndi Uziel: ndia bu ab͕uru ndi Kohat.

28. N'ọnu-ọgugu ndikom nile, site n'onye ruru otù ọnwa we gaba n'iru, ha di orú nnù na otù nnù ọgu iri, nēdebe ihe-ndebe nke ebe nsọ ahu.

29. Ab͕uru nile nke umu Kohat nāma ulo-ikwū-ha n'isi ebe-obibi ahu chere iru na Ndida.

30. Onye-isi ulo nna ab͕uru ndi Kohat nwere bu Elizafan nwa Uziel.

31. Ihe-ndebe-ha bu ib͕e ahu, na table ahu, na ihe-idọba-oriọna, na ebe-ichu-àjà abua, na ihe nile nke ebe nsọ ahu nke ha ji je ozi na ákwà-nkwuchi ahu, na òfùfè-ya nile.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 3