Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 3:11-23 Bible Nso (IGBOB)

11. Jehova we gwa Moses okwu, si,

12. Ma Mu onwem, le, esiwom n'etiti umu Israel were ndi Livai n'ọnọdu nwa ọ bula eburu uzọ mu nke nēmeghe àkpà nwa n'etiti umu Israel; ndi Livai gābu kwa ihe M'nwere:

13. n'ihi na Mu nwe nwa ọ bula eburu uzọ mu; n'ubọchi M'tib͕uru umu nile eburu uzọ mu n'ala Ijipt ka M'doro umu nile eburu uzọ mu n'Israel nsọ nye onwem, ma madu ma anumanu: nkem ka ha bu; Mu onwem bu Jehova.

14. Jehova we gwa Moses okwu n'ọzara Sainai, si,

15. Gukọta umu Livai, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, dika ab͕uru nile ha si di; nwoke ọ bula site n'onye ruru otù ọnwa we gaba n'iru ka i gāgukọta ha.

16. Moses we gukọta ha n'okwu-ọnu Jehova, dika enyere ya iwu.

17. Ndia bu kwa umu-ndikom Livai n'aha-ha; Giashon, na Kohat, na Merari.

18. Ndia bu kwa aha umu-ndikom Giashon dika ab͕uru nile ha si di; Libni na Shimai.

19. Umu-ndikom Kohat kwa dika ab͕uru nile ha si di; Amram, na Izha, na Hebron, na Uziel.

20. Umu-ndikom Merari kwa dika ab͕uru nile ha si di; Mahli na Mushi. Ndia bu ab͕uru ndi Livai, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di.

21. Nke Giashon bu ab͕uru ndi Libni, na ab͕uru ndi Shimai: ndia bu ab͕uru ndi Giashon.

22. Ndi-ha agukọtara agukọta, n'ọnu-ọgugu ndikom nile, site n'onye ruru otù ọnwa we gaba n'iru, ndi-ha águkotara agukọta di nnù iri-na-asatọ na ọgu iri-na-ise.

23. Ab͕uru abua nke ndi Giashon nāma ulo-ikwū-ha n'azu ebe-obibi ahu chere iru n'Ọdida-anyanwu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 3