Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 3:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma ndia bu osuso-ọmumu nile nke Eron na Moses n'ubọchi Jehova gwara Moses okwu n'ugwu Sainai.

2. Ndia bu kwa aha umu-ndikom Eron;ọkpara-ya, bú Nedab, na Abaihu, na Eleeza, na Itama.

3. Ndia bu aha nke umu-ndikom Eron, bú ndi-nchu-àjà ndi etere manu, ndi ọ mejuru aka ibu ndi-nchu-àjà.

4. Nedab na Abaihu we nwua n'iru Jehova, mb͕e ha wetara nso ọku ala ọzọ n'iru Jehova n'ọzara Sainai, ha enweghi kwa nwa; Eleeza na Itama we buru ndi-nchu-àjà n'iru Eron, bú nna-ha.

5. Jehova we gwa Moses okwu, si,

6. Me ka ebo Livai biaru nso, guzo kwa ha n'iru Eron, bú onye-nchu-àjà, ka ha we jere ya ozi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 3