Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 29:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Ọzọ, n'ọnwa nke-asa, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, nkpọkọta nsọ gādiri unu; ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje: ubọchi uda-opì ka ọ gāburu unu.

2. Unu gēme àjà-nsure-ọku ibu ihe ísì utọ anēsurere Jehova; otù nwa-oke-ehi, otú ebulu, umu-aturu asa nke b͕ara otù arọ nke zuru okè:

3. na onyinye-inata-iru-ọma-ha, bú utu ọka flour agwara manu, uzọ atọ n'uzọ iri iji chu oke-ehi ahu, uzọ abua n'uzọ iri iji chu ebulu ahu,

4. na otù uzọ n'uzọ iri iji chu nwa-aturu ọ bula nime umu-aturu asa ahu:

5. na otù nkpi iji chu àjà-nmehie, ikpuchiri unu nmehie-unu:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 29