Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 28:19-31 Bible Nso (IGBOB)

19. ma unu gēweta nso àjà-ọku, bú àjà nsure-ọku anēsurere Jehova; umu-oke-ehi abua, na otù ebulu, na umu-aturu asa nke b͕ara otù arọ: nke zuru okè ka ha gāburu unu:

20. na onyinye-inata-iru-ọma-ha, bú utu ọka flour agwara manu: uzọ atọ n'uzọ iri ka unu gāchu bayere otù oke-ehi, ọ bu kwa uzọ abua n'uzọ iri ka unu gāchu bayere ebulu ahu;

21. ọ bu kwa otù uzọ n'uzọ iri, otù uzọ n'uzọ iri, ka unu gāchu bayere nwa-aturu ọ bula nime umu-aturu asa ahu;

22. na otù nkpi iji chu àjà-nmehie, ikpuchiri unu nmehie-unu.

23. Unu gāchu ndia nāgughi àjà-nsure-ọku ututu, nke bu àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum.

24. Dika ihe ndia si di ka unu ganāchu kwa-ubọchi, ubọchi asa, nri nke àjà-ọku, nke ihe ísì utọ anēsurere Jehova: agāchu ya tiyere àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na àjà ihe-ọṅuṅu-ya.

25. N'ubọchi nke-asa nkpọkọta nsọ gādi-kwa-ra unu; ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje.

26. Ọzọ, n'ubọchi nkpuru mbu, mb͕e unu nēweta nso Jehova onyinye-inata-iru-ọma ọhu n'ememe izú asa nke ubọchi asa unu, nkpọkọta nsọ gādiri unu; ọ dighi ozi ọ bula nke òfufè unu gēje:

27. unu gēweta kwa nso àjà-nsure-ọku ibu ihe ísì utọ anēsurere Jehova; umu-oke-ehi abua, otù ebulu, umu-aturu asa nke b͕ara otù arọ;

28. na onyinye-inata-iru-ọma-ha, bú utu ọka flour agwara manu, uzọ atọ n'uzọ iri iji chu otù oke-ehi, uzọ abua n'uzọ iri iji chu otù ebulu ahu,

29. otù uzọ n'uzọ iri, otù uzọ n'uzọ iri, iji chu nwa-aturu ọ bula nime umu-aturu asa ahu;

30. otú nkpi, iji kpuchiri unu nmehie-unu.

31. Unu gāchu ha nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, (nke zuru okè ka ha gāburu unu), na àjà-ihe-ọṅuṅu-ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 28