7. Ndia bu ab͕uru ndi Reuben: ndi-ha agukọtara agukọta we di orú nnù uzọ ise, na nnù iteghete, na ọgu isi, na iri.
8. Umu ndikom Palu kwa; Eliab.
9. Umu-ndikom Eliab; Nemuel, na Detan, na Abairam. Ndia bu Detan ahu na Abairam ahu, ndi akpọrọ nke nzukọ Israel, ndi lusoro Moses, luso kwa Eron, ọ̀gù nime nzukọ Kora, mb͕e ha lusoro Jehova ọ̀gù:
10. ala we saghe ọnu-ya, loda ha na Kora, mb͕e nzukọ ahu nwuru; mb͕e ọku ahu ripiara ọgu ndikom iri-na-abua na iri ahu, ha we ghọ ihe-iriba-ama.
11. Ma umu-ndikom Kora anwughi.
12. Umu-ndikom Simeon, dika agburu nile ha si di: nke Nemuel bu ab͕uru ndi Nemuel: nke Jamin bu ab͕uru ndi Jamin: nke Jakin bu ab͕uru ndi Jakin:
13. nke Zera bu ab͕uru ndi Zera: nke Shaul bu ab͕uru ndi Shaul.
14. Ndia bu ab͕uru ndi Simeon, orú nnù uzọ abua, na nnù iri-na-ise, na ọgu iri.
15. Umu-ndikom Gad, dika ab͕uru nile ha si di: nke Zefon bu ab͕uru ndi Zefon: nke Hagi bu ab͕uru ndi Hagi: nke Shuni bu ab͕uru ndi Shuni:
16. nke Ọzni bu ab͕uru ndi Ọzni: nke Iri bu ab͕uru ndi Iri:
17. nke Arod bu ab͕uru ndi Arod: nke Areli bu ab͕uru ndi Areli.
18. Ndia bu ab͕uru umu-ndikom Gad, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, orú nnù uzọ ise, na nnu, na ọgu ise.
19. Umu-ndikom Juda, Ia na Onan: ma Ia na Onan nwuru n'ala Kenean.
20. Umu-ndikom Juda, dika ab͕uru nile ha si di, bu; nke Shila bu ab͕uru ndi Shila: nke Perez bu ab͕uru ndi Perez: nke Zera bu ab͕uru ndi Zera.
21. Umu-ndikom Perez bu kwa; nke Hezron bu ab͕uru ndi Hezron: nke Hamul bu ab͕uru ndi Hamul.
22. Ndia bu ab͕uru Juda, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, orú nnù uzọ iteghete, na nnù iri-na-otù, na ọgu ise.
23. Umu-ndikom Isaka, dika ab͕uru nile ha si di: nke Tola bu ab͕uru ndi Tola: nke Puva bu ab͕uru ndi-Punait:
24. nke Jashub bu ab͕uru ndi Jashub: nke Shimron bu ab͕uru ndi Shimron.
25. Ndia bu ab͕uru Isaka, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, orú nnù uzọ asatọ, na ọgu iri-na-ise.
26. Umu-ndikom Zebulun, dika ab͕uru nile ha si di: nke Sered bu ab͕uru ndi Sered: nke Ilon bu ab͕uru ndi Ilon: nke Jahleel bu ab͕uru ndi Jahleel.