Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 26:53-58 Bible Nso (IGBOB)

53. Ndia ka agēkere ala ahu n'ihe-nketa, n'ọnu-ọgugu aha.

54. Ndi bara uba ka i gēme ka ala-nketa-ha rie nne, ma ndi di ole-na-ole ka i gēme ka ala-nketa-ha di ntà; agēnye nwoke ọ bula ala-nketa-ya, dika ndi-ya agukọtara agukọta si di.

55. Nání ọ bu n'ife-nzà ka agēkè ala ahu: dika aha nile nke ebo nile nke ndi bu nna-ha si di ka ha gēketa.

56. Dika ife-nzà si di ka agēkè ihe-nketa-ha n'etiti ndi bara uba na ndi di ole-na-ole.

57. Ndia bu ndi agukọtara agukọta nke ndi Livai dika ab͕uru nile ha si di: nke Giashon bu ab͕uru ndi Giashon: nke Kohat bu ab͕uru ndi Kohat: nke Merari bu ab͕uru ndi Merari.

58. Ndia bu ab͕uru Livai: ab͕uru ndi Libni, ab͕uru ndi Hebron, ab͕uru ndi Mahli, ab͕uru ndi Mushi, ab͕uru ndi Kora. Kohat we mua Amram.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 26