Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 26:50-54 Bible Nso (IGBOB)

50. Ndia bu ab͕uru Naftali, dika ab͕uru nile ha si di: ndi-ha agukọtara agukọta we di orú nnù uzọ ise, na nnù iri-na-atọ, na ọgu iri.

51. Ndia bu ndi agukọtara agukọta nke umu Israel, orú nnù ogu uzọ atọ na uzọ iri-na-ise, na nnù anọ, na ọgu isi, na iri.

52. Jehova we gwa Moses okwu, si,

53. Ndia ka agēkere ala ahu n'ihe-nketa, n'ọnu-ọgugu aha.

54. Ndi bara uba ka i gēme ka ala-nketa-ha rie nne, ma ndi di ole-na-ole ka i gēme ka ala-nketa-ha di ntà; agēnye nwoke ọ bula ala-nketa-ya, dika ndi-ya agukọtara agukọta si di.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 26