Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 26:41-53 Bible Nso (IGBOB)

41. Ndia bu umu-ndikom Benjamin, dika ab͕uru nile ha si di: ndi-ha agukọtara agukọta we di orú nnù uzọ ise, na nnù iri-na-anọ.

42. Ndia bu umu-ndikom Dan, dika ab͕uru nile ha si di: nke Shuham bu ab͕uru ndi Shuham. Ndia bu ab͕uru nke Dan, dika ab͕uru nile ha si di.

43. Ab͕uru nile nke ndi Shuham, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, di orú nnù uzọ asatọ, na otù nnù.

44. Umu-ndikom Asha, dika ab͕uru nile ha si di: nke Imna bu ab͕uru ndi Imna: nke Ishvi bu ab͕uru ndi Ishvi: nke Beria bu ab͕uru ndi Beria.

45. Nke umu-ndikom Beria: nke Hiba bu ab͕uru ndi Hiba: nke Malkiel bu ab͕uru ndi Malkiel.

46. Ma aha nwa-nwayi Asha bu Sera.

47. Ndia bu ab͕uru umu-ndikom Asha, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, orú nnù uzọ isi, na nnù iri-na-atọ, na ọgu iri.

48. Umu-ndikom Naftali, dika ab͕uru nile ha si di: nke Jahzeel bu ab͕uru ndi Jahzeel: nke Guni bu ab͕uru ndi Guni:

49. nke Jiza bu ab͕uru ndi Jiza: nke Shilem bu ab͕uru ndi Shilem.

50. Ndia bu ab͕uru Naftali, dika ab͕uru nile ha si di: ndi-ha agukọtara agukọta we di orú nnù uzọ ise, na nnù iri-na-atọ, na ọgu iri.

51. Ndia bu ndi agukọtara agukọta nke umu Israel, orú nnù ogu uzọ atọ na uzọ iri-na-ise, na nnù anọ, na ọgu isi, na iri.

52. Jehova we gwa Moses okwu, si,

53. Ndia ka agēkere ala ahu n'ihe-nketa, n'ọnu-ọgugu aha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 26