Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 26:33-42 Bible Nso (IGBOB)

33. Ma Zelọfehad nwa Hefa enweghi umu-ndikom, ma ọ nwere umu-ndinyom: aha umu-ndinyom Zelọfehad bu Mahla, na Noa, na Họgla, na Milka, na Tiaza.

34. Ndia bu ab͕uru Manase: ndi-ha agukọtara agukọta we di orú nnù uzọ isi, na nnù iri-na-otù, na ọgu iri-na-ise.

35. Ndia bu umu-ndikom Efraim, dika ab͕uru nile ha si di: nke Shutela bu ab͕uru ndi Shutela: nke Beka bu ab͕uru ndi Beka: nke Tahan bu ab͕uru ndi Tahan.

36. Ndia bu umu-ndikom Shutela: nke Iran bu ab͕uru ndi Iran.

37. Ndia bu ab͕uru umu-ndikom Efraim, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, orú nnù uzọ anọ, na nnù, na ọgu ise. Ndia bu umu-ndikom Josef, dika ab͕uru nile ha si di.

38. Umu-ndikom Benjamin, dika ab͕uru nile ha si di: nke Bela bu ab͕uru ndi Bela: nke Ashbil bu ab͕uru ndi Ashbil: nke Ahairam bu ab͕uru ndi Ahairam:

39. nke Shefufan bu ab͕uru ndi-Shufamait: nke Hufan bu ab͕uru ndi Hufan.

40. Umu-ndikom Bela bu Ad na Neaman: nke Ad bu ab͕uru ndi Ad: nke Neaman bu ab͕uru ndi Neaman.

41. Ndia bu umu-ndikom Benjamin, dika ab͕uru nile ha si di: ndi-ha agukọtara agukọta we di orú nnù uzọ ise, na nnù iri-na-anọ.

42. Ndia bu umu-ndikom Dan, dika ab͕uru nile ha si di: nke Shuham bu ab͕uru ndi Shuham. Ndia bu ab͕uru nke Dan, dika ab͕uru nile ha si di.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 26