Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 26:31-37 Bible Nso (IGBOB)

31. nke Asriel bu ab͕uru ndi Asriel: nke Shekem bu ab͕uru ndi Shekem:

32. nke Shemida bu ab͕uru ndi Shemida: nke Hefa bu ab͕uru ndi Hefa.

33. Ma Zelọfehad nwa Hefa enweghi umu-ndikom, ma ọ nwere umu-ndinyom: aha umu-ndinyom Zelọfehad bu Mahla, na Noa, na Họgla, na Milka, na Tiaza.

34. Ndia bu ab͕uru Manase: ndi-ha agukọtara agukọta we di orú nnù uzọ isi, na nnù iri-na-otù, na ọgu iri-na-ise.

35. Ndia bu umu-ndikom Efraim, dika ab͕uru nile ha si di: nke Shutela bu ab͕uru ndi Shutela: nke Beka bu ab͕uru ndi Beka: nke Tahan bu ab͕uru ndi Tahan.

36. Ndia bu umu-ndikom Shutela: nke Iran bu ab͕uru ndi Iran.

37. Ndia bu ab͕uru umu-ndikom Efraim, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, orú nnù uzọ anọ, na nnù, na ọgu ise. Ndia bu umu-ndikom Josef, dika ab͕uru nile ha si di.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 26